Psalms 1

Nchịkọta Akwụkwọ nke mbụ

Abụ Ọma 1–41

Onye ihe na-agara nke ọma

1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,
nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.
Ha dị ka igbugbo ọka
nke oke ifufe na-efesasị.
5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;
ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.

6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.
Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Copyright information for IboBIU